Isaiah 11

Ome si nʼezinaụlọ Jesi

1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi;
otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,
inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,
Mmụọ ndụmọdụ na ike,
Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.

Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,
maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe;
ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa.
Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ,
ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,
ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.

6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;
agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,
ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,
ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.
Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
nʼelu ugwu nsọ m niile.
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma
nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ
Okwu a, “nke ugboro abụọ,” na-egosi na onwe mgbe ha lọtara nʼoge gara aga. Nlọghachi mbụ ha, bụ oge ha si Ijipt lọta.
inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,
Maọbụ, Patros
sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.

12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,
ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa
kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
13Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
a ga-ebipụ ndị iro Juda.
Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị ;
ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.
Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.
Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
15 Onyenwe anyị ga-eme
ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.
Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ
mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.
Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,
nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
16Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ
nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,
dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,
mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
Copyright information for IboBIU